Etu e si tụọ Sarah Ochekpe bụbụ Mịnịsta mkpọrọ afọ isii

Sarah Ochekpe

Ebe foto si, EFCC

Ụlọikpe ukwu dị na Jos, Plateu Steeti atụọla Sara Ochekpe mkpọrọ afọ isii maka nrụrụaka.

Sarah Ochekpe rụburu ọrụ dịka Mịnịsta na-ahụ maka mmiri oge Goodluck Jonathan bụ Onyeisiala Naịjirịa.

Ọ bụ ngalaba Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) kpụpụrụ Sara Ochekpe na mmadụ abụọ ndị ọzọ ụlọikpe n'afọ 2018.

Aha mmadụ abụọ ahụ bụ Raymond Dabo, bụbu onyeisi nchereoge nke pati PDP na Plateau Steeti; na Leo Jitong, bụbu onyeisi otu ịchụ nta vootu nke Goodluck Jonathan na Namadi Sambo na Plateau steeti n'afọ 2015

Sarah Ochekpe, Raymond Dabo na Leo Jitong

Ebe foto si, EFCC

Nkọwa foto, Sarah Ochekpe, Raymond Dabo na Leo Jitong

Dịka ndị EFCC si depụta n'ọba ozi ha, ọkaikpe Musa Kurya tụrụ mmadụ atọ mkpọrọ afọ isii n'otu n'otu maka ebubo abụọ e boro ha, nke ụlọikpe chọpụtara na ha dara iwu n'eziokwu.

Nke mbụ bụ na ha natara ego dị nde naịra 450 site n'aka Diezani Alison-Madueke, bụbu Mịnịsta na-ahụ maka mmanụ agbịdị, nakwa ụfọdụ ụlọọrụ na-emepụta mmanụ agbịdị, iji kwado nrụrụaka na ntuliaka ọkwa onyeisiala e mere n'afọ 2015.

Ebubo nke abụọ bụ na mmadụ atọ a gara n'ụlọakụ dọrọ ego ruru nde naịra 450, n'agbanyeghị na ọ gafere ego ole iwu Naịjirịa nyere mmadụ ikike ịdọrọ n'ụlọakụ.

Ha atọ kwuru na ha nyefere ego ahụ n'aka onye omeiwu larala mmụọ ugbua aha ya bụ Gyang Pwajok, onye jibu aha pati PDP azọ ọkwa Gọvanọ Plateau steeti n'oge ahụ.

Mana ha egosighị ụlọikpe ihe akaebe ọbụla gosiri na ha nyere nwoke ahụ ya bụ ego n'eziokwu.

N'ebubo nke mbụ, ọkaimpe Kurya mara ha ikpe ma tụọ ha mkpọrọ afọ atọ, maọbụ ha akwụọ nde naịra abụọ iji hapụ ịga mkpọrọ.

Etu ahụ kwa ka o si maa ha ikpe ma nyekwa ha ntaramahụhụ n'ebubo nke abụọ.

Cheta na iwu Naịjirịa a kpọrọ "Money Laundering Prohibition Act, 2012" machiri mmadụ ịdọrọ ego karịrị nde naịra iri n'otu oge n'ụlọakụ.

Dịka iwu ahụ siri dị kwuo, onye ọbụla dara iwu ahụ kwesịrị ka atụọ ya mkpọrọ afọ atọ, maọbụ daa ya nha naịra iri.

Sara Ochekpe - Ihe ị kwesịrị ịma maka ya

  • A mụrụ ya n'abalị anọ nke ọnwa Ọkụtoba afọ 1961
  • Nne na nna ya si Plateau steeti, mana di ya bụ ọkammụta Nelson Ochekpe bụ onye Otukpo, Benue Steeti
  • Di ya bụ ọkammụta na ngalaba 'Pharmaceutical Chemistry' nke Mahadum Jos, ma bụrụkwa osote onyeisi Mahadum ahụ site n'afọ 2014 ruo 2018
  • Sarah Ochekpe gụrụ akwụkwọ na Mahadu Ahmadu Bello Zaria nakwa Mahadum Jos,
  • Ọ rụburu ọrụ dịka otu n'ime ndị isi n'ụlọọrụ 'National Orientation Agency'

Ndị Mịnịsta Naịjirịa eborola ebubo nrụrụaka na izu ego gọọmentị

Dịka otu APC weghaara ọchịchị n'aka ndị PDP n'afọ 2015, gọọmentị Naịjirịa akpụpụla ọtụtụ ndị nọrọ n'ọkwa di elu na gọọmentị ụlọikpe n'ihi ebubo nrụrụaka.

Ọtụtụ n'ime ha gụnyere ndị Gọvanọ, ndị mịnịsta, ndị isi ndị agha, nakwa ndị ọzọ ọkwa ha gbalitere agbalite na gọọmentị.

Lee ụfọdụ ndị mịnịsta akpụpụrụla ụlọikpe maka ebubo nrụrụaka:

  • Nenadi Usman - rụrụ ọrụ dịka Mịnịsta na-ahụ maka egoE boro ya ebubo nrụrụaka ruru ijeri naịra 4.6
  • Femi Fani-Kayode - rụrụ ọrụ dịka Mịnịsta njem ụgbọeluE boro ya ebubo nrụrụaka ruru ijeri naịra 4.6
  • Diezani Alison-Madueke - rụrụ ọrụ dịka Mịnịsta na-ahụ maka mmanụ agbịdịGọọmentị sị na ha ejichiela ego karịrị nde dọla 153, nakwa ihe akụnụba ndị ọzọ ọnụego ya karịrị nde dọla 80 n'aka ya
  • Stella Odua - bụbu Mịnịsta njem ụgbọeluE boro ya ebubo nrụrụaka ruru ijeri naịra ise

Rochas Okorocha abịaghị ụlọikpe ịzara ọnụ ya n'ebubo ndị EFCC boro ya

Rochas Okorocha

Anya ahụghị aka chịburu Imo steeti bụ Rochas Okorocha n'ụlọikpe taa bụ Tuzde, Febrụwarị 22, dịka ndị EFCC bupuru ebubo ha na-ebo ya n'ụlọikpe dị n'Abuja.

EFCC boro Okorocha na mmadụ isii ndị ọzọ ebubo iri ego gọọmentị ruru ijeri naịra abụọ na ụma itoolu.

Dịka a kpọlitere ya bụ okwu n'ụlọikpe, ọkaiwu ndị EFCC bụ Cosmos Ugwu kwuru na ha agbaala mbọ niile ha nwere ike inye Okorocha akwụkwọ ikpe, mana ọ na-ezo ezo.

Ugwu kwuru na ndị ọrụ nchekwa na-eche Okorocha nche anaghị ekwe ka ha rute ya nso iji nye ya akwụkwọ ụlọikpe ji akpọ ya oku.

Nke a mere ka ọkaiwu Inyang Ekwo yigharịa ikpe a ka ọ dịzie n'abalị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Maachị 2022.

Cheta na Okorocha ekwuola ugboro ugboro na aka ya dị ọcha n'ebubo ahụ.

Okorocha gbakwara ndị EFCC akwụkwọ n'ụlọikpe dị na Port Harcourt, Rivers Steeti n'ihi okwu a.

N'ụbọchị asatọ nke ọnwa Febrụwarị 2022, ọkaikpe Stephen Pam nyere ndị EFCC iwu ka ha kwụsị inye Okorocha nsogbu ruo mgbe ọ ga-ekpebi ikpe ahụ.

N'otu aka ahụ kwa, Okorocha gara njem nleta n'ụlọọrụ Onyeisiala Muhammadu Buhari n'abalị atọ nke ọnwa Febrụwarị ebe ọ nọrọ kọọrọ ya ihe ya ndị EFCC na-aga.

Okorocha kwuru na ya gwara Buhari ka ọ gwa ndị EFCC ka ha rube isi n'iwu ụlọikpe nyere ha ma hapụ ya aka.

Putin enyela ndị agha Russia ikike ka ha banye mba Ukraine

Valdimir Putin

Onyeisiala mba Russia bụ Vladmir Putin enyela ndị agha ha iwu ịbanye mpaghara nnupuisi abụọ na mba Ukrain dịka ha nabatara ha ka mba nweere onwe ha.

Rọshịa na-ekwu na ndị agha ha na-aga ịchekwa udo na mpaghara ndị a.

Mana onyeisiala mba Yukren bụ Volodymyr Zelensky ekwuola na oge eruola iji mara ndị kwadoro ha n'ezie nke na abụghị egbe ọnụ.

N'aka nke ọzọ, mba Amerịka na-ekwu na ihe Rọshịa na-ekwu maka udo enweghị isi ma sị na Rọshịa na-achọ ohere ha ga-esi bute agha.

Ụfọdụ mba ruru iri nke gụnyere UK na-atule ntaramahụhụ ha ga-enye mba Rọshịa maka ihe a ha mere.

Cheta na Rọshịa na-akwado mpaghara Luhansk na Donetsk n'ọgụ nwereonwe ha n'aka mba Yukren kamgbe afọ asatọ.

Dillian Whyte ekwetela na ya na Tyson Fury ga-apịrị ya

Dillian Whyte na Tyson Fury

Ebe foto si, Getty Images

Oti ọkpọ Dillian Whyte ekwetela na ọ ga-ezute Tyson Fury n'ọgụ ịzọ ọkwa WBC.

A na-atụ anya na ọ bụ n'ụbọchị iri abụ na atọ nke ọnwa Aprel ka ha nwereike izute onwe ha.

Whyte gbara afọ 33 akụọla ọkpọ iri atọ, merie 28 ma emeriri ya n'abụọ.

Ebe Fury dịkwa afọ 33, akụọla ọkpọ 32 ebe enweghị onye meriri n'otu.

Fury ga-erite nde pawụnd iri abụọ ebe Whyte ga-erite nde pawụnd ise na ụma isii na ya bụ ọgụ.