July 4th in USA: Etu ndị Igbo bi US si sonye emume ha

Ebe foto si, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Mmemme na ndị Igbo dịka nwanne na nwanne, ya mere emume #4thofJuly na mba Amerịka apụghị iche.

N'agbanyeghị na ọ bụ ụbọchị ndị mba Amerịka ji eme ncheta ụbọchị ha nwetara onwe ha n'aka ndị Briten, ọtụtụ ndị ọzọ, ọkachasị ndị Naịjirịa na-arụ ọrụ ebe ahụ, na-ahụta ya dịka ụbọchị ezumike nakwa inwe aṅụrị.

Maka na ọtụtụ ndị Igbo bi na mba Amerịka, BBC Igbo ga-egosi gị etu ha si sonye n'emume nke afọ a.

Ihe ndị Igbo na-eme

1) 'Fireworks':

Maka na ndị Amerịka na-eji ụbọchị ahụ agbapụ ihe bekee kpọrọ 'fireworks', ọtụtụ ndị Igbo na-eso gaa ebe ha ga-ahụ ya.

Georgina Onuoha bụ onye na-emebu ihe nkiri na Naịjirịa, tinyere onyonyo gosiri 'fireworks' nke ọ hụrụ.

Skip Instagram post, 1
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of Instagram post, 1

2) Ụbọchị ezumike:

Ọtụtụ ndị Igbo na-arụ ọrụ n'Amerịka, na-eji ụbọchị ahụ zuru ike ma cherekwa maka ọrụ na-abịa n'ihu.

Oluomachi Mbamara bụ otu nwaanyị Igbo bi na New Jersey, gwara BBC Igbo na ụbọchị #4thofJuly bụ ụbọchị ndị Naịjirịa na-eji ezu ike, ebe ụfọdụ na-eji ohere ahụ gaa leta ikwu na ibe ha.

3) Ụbọchị oriri:

Ebe foto si, Abigail

Mbamara kwukwara na ọ bụ ụbọchị ha na-eji eme oriri na ọṅụṅụ. Ha na-eji ya ata anụ a hụrụ n'ọkụ nke bekee kpọrọ 'barbecue'.

O kwukwara na ụfọdụ oge, ndị mba Amerịka na-akpọ ha oku bịa sonye ha n'oriri na ọṅụṅụ.

4) Ụbọchị nlegharị anya:

Ha na-eji ya aga ebe ndị mmadụ na-agbakọ elegharị anya, ebe ndị dịka New York.

N'aka ọzọ, onye ome ihe nkiri nakwa ọkpa ọchị bụ Williams Uchemba kwuru na ọ maghị ihe ụbọchị ahụ pụtara.

O mere ihe nkiri iji kọwaa nke a.

Skip Instagram post, 2
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of Instagram post, 2

Akụkọ ndị ga-amasị gị: