Lee ọnọdụ ọjọọ ụfọdụ ụlọakwụkwọ dị n'Ebonyi steeti
Ụfọdụ ụlọakwụkwọ dị n'Ebonyi steeti nọ n'ọnọdụ ọjọọ ugbua site na mmebi nakwa ịda nwayọ nwayọ.
Nyocha BBC mere chọpụtara na ụlọakwụkwọ ndị a bụ ndị nke gọọmentị nwe.
Otu onye nkuzi n'ime otu ụlọakwụkwọ anyị gara nleta kọwara na ọnọdụ ahụ adịghị ha mma chaa chaa.
Ọ sị "mmiri malite izo, anyị achụlaa ụmụ akwụkwọ n'ihi na o nweghi ihe ga-egbochi mmiri ịma ha"
Ịlegharịa anya na bụ ụlọakwụkwọ, ịnwereike ịhụ na ụfọdụ ụlọ dị ebe ahụ na-akwado ịda, nke mere na akwụsịla nkuzi n'ebe ahụ kpam kpam.
Ihe ọzọ bụ na ụfọdụ kwa enweghi mkpuchi n'elu ha nke mere na mmiri maọbụ ihe ọbụla ga na-enye ụmụakwụkwọ nsogbu ma o rue oge mmụta.
Kọmịshọna agụmakwụkwọ na steeti ahụ bụ Sunday Nwangele kwuru na gọọmentị ma anya ọnọdụ ụfọdụ n'ime ụlọakwụkwọ ndị ahụ.
O kwukwara na ọ bụ nwayọ nwayọ ka ha ji arụgharị ụlọakwụkwọ gọomentị ndị dị na steeti ahụ.
"Gọọmentị enweghi ike ịme ihe niile otu mgbe, ya mere o ji bụrụ ọrụ nke nke" ka o kwuru.
Lee ihe onyonyo a n'uju ebe a.




