NEC agwala Onyeisiala Tinubu ka o wezuga atụmatụ inwogharị ụgwọ ụtụisi

Akụkọ ndị dị mkpa n'ọnwa Ọktoba.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Jessica Nwankwo, Michael Ilediagu, Ikechukwu Kalu, Uche Akolisa, Adline Okere.

  1. SSANU na NASU ga-amalite abụbụọrụ n’ụbọchị Tuzde

    Ndị otu SSANU na NASU na-eme ngagharịiwe

    Otu jikọtara ndị nkụzi mahadum ọkwa ha dị elu bụ Senior Staff Association of Nigerian Universities (SSANU) na otu jikọtara ndị ọrụ abụghị ndị nkụzi n’ụlọakwụkwọ dị elu na Naịjirịa bụ Non Academic Staff Union of Educational and Associated Institutions (NASU) ekwupụtala abụbụọrụ amaghị mgbe ọ ga-akwụsị na mahadum etiti niile dị na Naịjirịa.

    Otu onye ndu otu SSANU na mahadum Federal University of Technology Owerri bụ Maazị Franklin Duru kwuru na abụbụọrụ ahụ ga-amalite n’ụbọchị Tuzde 29 Ọktoba 2024.

    Dịka Franklin Duru siri kwuo “ọ ga-abụ ịkwụsị ọrụ kpamkpam na mahadum niile dị na Naịjirịa site n’ụlọorụ Onyeisi mahadum bụ Vice Chancellor ruo n’ụlọorụ onye Registrar, ụlọorụ na-ahụ maka ọdịmma ụmụakwụkwọ nakwa ebe niile.”

    Ọ sịrị na ndị ndu SSANU na NASU na Naịjirịa nyere ha ntụziaka ka ha hazie nzukọ na mahadum ha dị iche iche n’ụbọchị Mọnde 28 Ọktoba 2024 iji gwa ndị otu ha gbasara abụbụọrụ ahụ ma hụkwa na onye ọbụla rubere isi.

    Cheta na n’ime ọnwa Maachị afọ a ka ndị otu SSANU na NASU gbara abụbụọrụ ịdọ aka na ntị abalị asaa iji kpọọ oku ka gọọmenti lebara ọnọdụ ha anya.

  2. Alex Mascot Ikwechegh nọ n'aka anyị azara ajụjụ ugbua - Ndị uweojii

    Ikwechegh

    Ebe foto si, Alex Mascot Ikwechegh/Instagram

    Ndị uweojii n'Abuja ekwuola na onye omeiwu na-ewu ewu bụ Alex Mascot Ikwechegh nọ n'aka ha azara ọnụ ya ugbua.

    Ha kwuputara nke a n'ozi nke ọnụ na-ekwuru ha bụ Josephine Adeh binyere aka.

    "Anyị na-elebanye anya n'ihe mere n'etiti onyeomwieu nakwa onye bịara ịwetara ya ihe nke mere ka etie onye wetara ihe ihe" ka ozi ahụ kwuru.

    Ndị uweojii kwukwara na ọ na-echekasị ha etu Ikwechegh is eleli ụlọọrụ onyeisi ndị uweojii anya ma kwuo na o gosiri na o nweghi nsọpụrụ n'ebe iwu nọ.

    Kedụ ka okwu a si malite?

    Ihe onyonyo nke BBC hụrụ anya ebe onye ọzọ bụ Vincent Ose na-agba nwoke ahụ ajụjụ ọnụ, o kwuru na ihe butere esemokwu n'etiti ha abụọ bụ na ọ bịara ibutere onye omeiwu ihe eziri ya butere ya.

    Mana mgbe o ruru ebe ahụ, ọ hụ onye nọ anị n'oche, ọ maghị na ọ bụ ya ka o kwesiri inye ihe o ji mana mgbe ọ kpọrọ akara ekwentị o ji, nke omeiwu Ikwechegh a kụọ.

    Ọ sị na ọ bụ mgbe ahụ ka Ikwechegh malitere ị bara ya mba, esemokwu amalite o were tie ya ihe dịka onyonyo mbụ ahụ si gosi.

    Alex Mascot na nwoke a sị ọ mara ụra

    Ebe foto si, alex_mascot/Instagram/screenshot

    Ndị uweojii Naịjirịa ekwuputala na akụkọ na-efegharị ebe otu onye omeiwu mara mmadụ ụra n'ihe onyonyo eruola ha ntị.

    N'ozi ha weputara ha kwuru na ha na-enyo akụkọ ahụ enyo dịka nwoke nọ n'ime onyonyo ahụ bụ Stephen Abuwatseya bịara mee mkpesa n'ụlọorụ ha dị na Maitama.

    Ha dọkwara aka na ntị ma kwuo ka ndị mmadụ kwụsị ịkpọ aha maọbụ ụlọorụ onyeisi ndị uweojii na nkịtị maọbụ jiri ya majaa ndị mmadụ.

    Nke a na-abịa dịka ihe onyonyo na-efegharị ebe onye echeere bụ Alex Mascot Ikwechegh na-abara nwoke mba na-ajụ ya "Ịmakwa onye m bụ".

    O mechara pụtakwa ọzọ kwuo "A ga m eme gị ka ị fuo, o nweghi ihe ga-eme"

  3. A kpọọla oku ka a zụtara Osote Onyeisiala Shettima ụgbọelu ọhụrụ

    Osote Onyeisiala Naịjirịa Kashim Shettima

    Ebe foto si, Stanley Nkwocha/X

    Nkọwa foto, Osote Onyeisiala Naịjirịa Kashim Shettima

    Ọnụ na-ekwuru ụlọomeiwu Borno steeti bụ Abdulkarim Lawan akpọọla oke ka a zụtara osote onyeisiala Kashim Shettima ụgbọelu ọhụrụ iji hụ na e chekwara ndụ ya.

    Nke a na-abịa dịka ụgbọelu osote onyeisiala mebiri na mba Amerịka n’izuụka gara aga dịka ọ na-aga ịnọchiteanya Onyeisiala n’ọgbakọ Commonwealth e mere na Samoa.

    Lawan kwuputara nke a n’akwụkwọ ozi o wepụtara ma kpọkuo Onyeisiala Bola Tinubu ka a zụtara osote ya ụgbọelu ọhụrụ iji gbochie ihe mberede ọbụla nwereike ịta isi Kashim Shettima.

    Cheta na na mmalite afọ a, kọmitii ụlọomeiwu nta na-ahụ maka nchekwa na nnyocha nyere iwu ka a zụtara Onyeisiala Bola Tinubu na osote ya ụgbọelu ọhụrụ mana nke a kpalitere ọtụtụ mmụọ ụmụafọ Naịjirịa

  4. Ụgbọelu Onyeisiala Tinubu abụghị nke ọhụrụ, ọ bụ nke a rụgharịrị - Bayo Onanuga

    Ugboelu ọhụrụ a zụtara Onyeisiala Bola Tinubu

    Ebe foto si, Bayo Onanuga/X

    Nkọwa foto, Ugboelu ọhụrụ a zụtara Onyeisiala Bola Tinubu

    Ọnụ na-ekwuru onyeisiala bụ Bayo Onanuga ekwuola na ụgbọelu ahụ a zụtara onyeisiala Bola Tinubu abụghị nke ọhụrụ kama na ọ bụ nke a rụgharịrị.

    Ọ gbara okwu a n’anwụ n’ụlọọrụ Channels ma kwuo na ụgbọelu ahụ abụghị nke onyeisiala kama na ọ bụ nke ụmụ Naịjirịa niile.

    Onanuga kwuru na ụfọdụ ụgbọelu dị n’ọdọ ụgbọelu onyeisiala dịka ụgbọelu Boeing BH737-700 nke a zụtara oge Olusegun Obasanjo bụ onyeisiala emebiela tinyere na ego e ji emezi ha dị oke ọnụ.

    O kwuru na ọ bụ nke a mere ụlọọrụ onyeisiala jiri kpebi ka ha zụta ụgbọelu a rụgharịrị ka dị mma kama ịzụta nke ọhụrụ dị oke ọnụ.

    Bayo Onanuga kpọrọ oku ka onye ọbụla buru n’obi na ndụ onyeisiala dị oke mkpa.

  5. NDLEA ejichiela ọgwụike e zoro n’okpuru akpụkpọụkwụ

    NDLEA ejichiela ọgwụike e zoro n’okpuru akpụkpọụkwụ

    Ebe foto si, NDLEA

    Nkọwa foto, NDLEA ejichiela ọgwụike e zoro n’okpuru akpụkpọụkwụ

    Ndị ọrụ National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA) ejichiela ọgwụike ndị e zoro n’okpuru akpụkpọụkwụ.

    Ozi Onyeisi ngalaba mgbasaozi NDLEA bụ Femi Babafemi wepụtara kwuru na e jichiri ọgwụike ndị ahụ n’ọdọụgbọelu Murtala Muhammed International Airport dị na Legọs oge a chọrọ ịtụga ha mba Cyprus.

    Babafemi sịrị na ọgwụike ndị e jichiri gụnyere mkpụrụ tramadol puku abụọ, otu narị na iri na asatọ (2,118) e zoro n’okpuru akpụkpọụkwụ iri na atọ (13) wee chọọ ịtụga mba Cyprus n’abalị 12 Ọktoba 2024.

    Ha gakwara n’ihu jichie mkpụrụ tramadol narị atọ na iri asatọ (380) n’ụlọ onye zipụrụ ya bụ Okenwa Kelvin Uchenna oge ha gara n’ụlọ ya bụ nwaamadị dị n’Enugu n’abalị 24 Ọktoba 2024.

    Ozi ahụ kwuru na ihe ndị ọzọ NDLEA wetere n’ụlọ Okenwa oge ha nwuchiri ya gụnyere narị puku naịra itolu na iri isii na asatọ, narị asatọ na iri asatọ (968,880) na ụgbọala Toyota Avalon nke akara ya bụ UWN 389 AS.

  6. A nwụchiela nwaanyị jị akaodo kụjie nwa nwunye di ya dị afọ atọ ụkwụ n’Enugu

    A nwụchiela nwaanyị jị akaodo kujie nwa nwunye dị ya dị afọ atọ ụkwụ n’Enugu

    Ebe foto si, Enugu state government

    N’Enugwu steeti, ndị uweojii anwụchiela otu nwaanyị aha ya bụ Ada Ogbogu maka ebubo iji akaodo kujie nwa nwunye di ya ụkwụ n’Emene dị na steeti ahụ.

    Kọmịshịọna na-ahụ maka ụmụaka, ihe gbasara mmadụ na ibe ya bụ Ngozi Enih kwuru na ha gara nwuchie nwaanyị ahụ oge ha nụrụ ihe mere.

    N’okwu ya “N’ụbọchị Fraịde 25 Ọktoba 2024 ka anyị gara nwụchie Ada Ogbogu bụ onye bị na Sunrise Estate n’Emene”.

    “Oge a gwara m maka mkpamkpa Ada Ogbogu kpara ka m kpọọrọ ndị uweojii gaa n’ebe ahụ mana anyị ahụghị ya.”

    “Anyị chọọrọ ya gaa n’ụlọọgwụ Orthopaedic bụ ebe anyị nọ wuchie ya ka anyị kpọtụchara ndị isi ụlọọgwụ ahụ”.

    “Anyị gakwara n’ebe onye ọ kujiri ụkwụ nọ ka anyị na ndị dọkịnta na-elekota ya nwee mkparịtaụka”. “Obere nwa nwoke ahụ dị naanị afọ atọ.

    A kujiri ya ụkwụ na ọkpụkpụ ukwu ya”. Ngozi Enih kwuru na nwunye Gọvanọ Enugwu bụ Nkechinyere Mbah kwere nkwa na ya ga-akwụ ụgwọ ụlọọgwụ ma hụ na nwatakịrị ahụ nwetere ikike dịịrị mmadụ.

  7. CAF ekwupụtala Naịjirịa dịka ndị nwetara mmeri n’amamaaka ntozuoke kwesịrị ị dị n’etiti ha na Libya

    CAF ekwupụtala Naịjirịa dịka ndị nwetara mmeri n’amamaaka ntozuoke kwesịrị ị dị n’etiti ha na Libya

    Ebe foto si, CAF

    Ngalaba otu Confedreration of African Football (CAF) na-ahụ maka ezi akparamaagwa na inye ntaramaahụhụ zukọrọ gbasara nsogbu dapụtara n’amamaaka ntozuoke kwesịrị ị dị n’etiti otu egwu bọọlụ Super Eagles nke Naịjirịa na Mediterranean Knites nke mba Libịa.

    Otu ahụ nwere mkpebi ndị gụnyere na na otu Libya Football Federation (LFF) dara iwu dị na mpaghara 31 nke iwu TotalEnergies CAF Africa Cup of Nations Regulations tinyere mpaghara 82 na 151 nke CAF Disciplinary Code.

    Ha kpebiri na Libịa dara ụkọ n’amamaaka ahụ kwesịrị ị dị na Benghazi n’abalị 15 Ọktoba 2024 ma kwuo na Naịjirịa ji ọkpụ goolu atọ asataghị otu (0:3) merie ha.

    CAF nyekwara iwu ka LFF kwụọ nha dọla puku iri ise ($50,000) n’ime mkpụrụ ụbọchị iri isii (60) e wepụtara ozi a.

  8. A nwụchiela onye uweojii maka ịgbagbu otiegwu n’Enugu steeti

    A nwụchiela onye uweojii maka ịgbagbu otiegwu n’Enugu steeti

    Ebe foto si, Getty Images

    A nwụchiela ma jichie onye uweojii na-arụ ọrụ na ngalaba ụlọọrụ ndị uweojii na-ebu agha megide otu nzuzo n’Enugwu steeti maka ịgbagbu otiegwu bụ Okezie Chikezie Mba, onye a maara dịka Igbo-Jah.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Enugwu steeti bụ Daniel Ndukwe kwuputara nke a n’ozi ọ wepụtara n’ụbọchị Satọde 26 Ọktoba 2024.

    Ndukwe sịrị na Igbo-Jah bịara njem nleta n’ụlọọrụ ndị uweojii n’ụbọchị Fraịde 25 Ọktoba 2024 ma dịka ọ na-ala mgbe o jiiri ihe dịka nkeji iri gaa elekere asatọ nke abalị, onye uweojii ahụ gbapụrụ mgbọ ma gbagbuo ya.

    Ozi ahụ kwuru na e buuru nwoke ahụ gawa ụlọọgwụ ozugbo bụ ebe Dọkịta nọọrọ kwuputa ya dịka onye nwụrụ anwụ.

    Ọ sịrị na a dọnyela ozu nwoke ahụ nwụrụ anwụ n’ọbaozu maka ime ya nnyocha ebe kọnịshọna ndị uweojii Enugwu steeti bụ Kanayo Uzuegbu nyere iwu ka e mee nnyocha miri emi iji hụ na e nyere onye uweojii ahụ ntaramaahụhụ kwesịrị ekwesị.

    Ka o sinadị, Kanayo kasiri ezinaụlọ, ndị enyi na ndị ha na Igbo-Jah na-emekọ ihe obi ma kwe ha nkwa na onye ọbụla a chọpụtara aka ya dị n’ọnwụ nwaamadị ahụ ga-anatarịrị ntaramaahụhụ kwesịịrị ya.

  9. Israel atụgwaraala Iran ogbuniigwe

    Israel atụgwaraala Iran ogbuniigwe

    Ndịagha Izrel kwuru na ha atụchaala ogbuniigwe n’ogbe ndịagha Ịran.

    Dịka ozi ha wepụtara siri kwuo “obere oge gara aga, ndịagha Izrel tụchara ogbuniigwe nke lekwasara anya n’ogige ndịagha Iran n’ogbe dị iche iche”.

    Ozi ahụ gara n’ihu kwuo na “ụgbọelu anyị niile alọghachila n’udo.”

    Oge ọ ga-ekwu okwu gbasara ọnọdụ ahụ, otu onye na-ekwuchitere Gọọmenti United Kingdom sịrị na Lọndọn “na-elebara ọnọdụ ahụ anya nke ọma”.

    “Anyị kwadoro ikikere Izrel nwere ichekwa onwe ya siten’ịgbaso iwu mbaụwa. Ịga n’ihu n’ọgbaaghara ahụ enweghị onye ọ ga-abara uru,” ka ọ gbakwunyere.

    Na mbụ, Izrel kwuru na mwakpo ahụ lekwasara anya n’ogige ndịagha Ịran mana ugbua Tehran akọwaala nke a dịka eziokwu.

    N’ozi ndịagha elu Ịran wepụtara, ha kwuru na a wakporo ogige ndịagha dị na mpaghara Tehran, Khuzestan na Ilam.

    Ozi ahụ kwuru “anyị egbochiela mwakpo ndị ahụ nke ọma mana e nwere “obere mbibi” na mpaghara ụfọdụ.

    A tụrụ anya na Izrel ga-awakpo Ịran n’ihi na oge Ịran jichara ogbuniigwe wakpoo ha n’ụbọchị mbụ nke ọnwa Ọktoba ka Izrel kwuru na ha na-abịa.

  10. Gọvanọ Peter Mba akwadoola ụgwọọnwa opekatampe 80,000 maka ndị ọrụ Enugu steeti

    Gọvanọ Peter Mba akwadoola ụgwọọnwa opekatampe 80,000 maka ndị ọrụ Enugu steeti

    Ebe foto si, Dan Nwomeh/Facebook

    Aka na-achị Enugwu steeti bụ Peter Mbah enyela nkwado ka a malite ịkwụ ndị ọrụ steeti ahụ ụgwọọnwa opekatampe ọhụrụ bụ puku naịra iri asatọ (80,000).

    Mbah kwuputara nke a n'ụbọchị Tọzde 24 Ọktoba 2024 oge ya na kọmitii na-ahụ maka itinye ụgwọọnwa opekatampe ọhụrụ n'ọrụ nwere nzukọ.

    Ọ sịrị na ọnọdụ ahụ ga-amalite n'ọnwa Ọktoba ma bụrụkwa nke ga-emetụta ndị ọrụ Steeti na ndị nke Okpuru ọchịchị dịka ọ sịrị na ịkpalite mmụọ ndị ọrụ ga-eme ka gọọmenti ya nwetazuo ọhụ ha.

    Ka o siladị, otu jikọtara ndị ọrụ n'Enugwu steeti kọwara ọnọdụ ahụ dịka nke ahụtụbeghị ụdị ya mbụ na steeti ahụ n'ihi na ihe a bụ nke mbụ ya ndị ọrụ Enugwu steeti na-eri ụgwọọnwa karịa ndị ọrụ Etiti.

    Onyeisioche otu Nigeria Labour Congress n'Enugwu steeti bụ Fabian Nwigbo kelere Gọvanọ Peter Mbah maka iji ọdịmma ndị ọrụ kpọrọ ihe dị oke mkpa oge niile ma kọwaa ụgwọọnwa opekatampe ọhụrụ ahụ dịka "ihe ukwu meere ndị ọrụ n'Enugwu steeti."

    Gọvanọ Peter Mba akwadoola ụgwọọnwa opekatampe 80,000 maka ndị ọrụ Enugu steeti

    Ebe foto si, Dan Nwomeh/Facebook

  11. Uju Kennedy Ohanenye ekeleela Onyeisiala Tinubu maka ohere o nyere ya ịbụ minista

    Uju Kennedy Ohanenye na Onyeisiala Bola Tinubu

    Ebe foto si, Uju Kennedy Ohanenye/Bola Tinubu/X

    Nkọwa foto, Uju Kennedy Ohanenye na Onyeisiala Bola Tinubu

    Onye a chụrụ n'ọrụ dịka minista na-ahụ maka ụmụnwaanyị bụ Uju Kennedy Ohanenye, ekelela onyeisiala Bola Tinubu maka ohere o nyere ya ịrụ ọrụ dịka minista na-ahụ maka ụmụnwaanyị.

    N’ozi o wepụtara n’akara soshal midia X ya, Uju Ohanenye kelere onyeisiala maka ntụkwasịobi o nwere ebe ọ nọ iji rụọ ọrụ maka agamnihu Naịjirịa.

    O kelekwara nwunye onyeisiala bụ Oluremi Tinubu maka etu o si gbaa ya ume ma kwado ya.

    Uju Kennedy Ohanenye kwuru na ọ ga-aga n’ihu na-enye ọchịchị onyeisiala Bola Tinubu nkwado ma rụọ ọrụ maka mmepe na ọdịmma Naịjirịa

  12. Pius Iguh: Etu ndị agha Naịjirịa jiri nwuchie onye ha si bụ onyeisi ndị omekome n'Orsu

    Onyeisi mgbasaozi ụlọọrụ nchekwa bụ Edward Buba

    Ebe foto si, DEFENCE HQ NIGERIA/X

    Nkọwa foto, Onyeisi mgbasaozi ụlọọrụ nchekwa bụ Edward Buba

    Isiụlọọrọ ngalaba nchekwa Naịjirịa a kpọrọ “Defence Headquarters” ekwuola na ha nwetara mmeri n’agha na-alụ iji megide ndị omekome n’eyi ọha egwu ma na-akpa mkpamkpa na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa.

    Onyeisi mgbasaozi ndịagha bụ Edward Buba kwuru na ndịagha otu FOB nọ ọrụ n’Orsu, Imo steeti nwuchiri onyeisi otu nnwereonwe Biafra bụ 'Indigenous People of Biafra (IPOB) aha ya bụ Pius Iguh onye ha kwuru na ọ bụ onye so hibe otu ESN n’Imo steeti.

    N’aka nke ọzọ, ndịagha FOB nọ ọrụ na’Amaraku nwụchiri otu onye ọzọ bụ onyeisi ndị IPOB aha ya bụ Emmanuel Onwugu n’okpuru ọchịchị Mbano, Abia steeti ma nwụchie onyeisi otu nzuzo aha ya bụ Ifeanyi Rock na ndị otu ya na mpaghara Arochukwu, Abia steeti.

    Ozi ahụ kwuru na ndịagha nwụchiri ndị omekome ndị ọzọ ruru 135 ma gbuo ndị omekome 140. A nwụchikwara ndị omekome 18 n’awakpo ụlọọrụ mmanụ ụgbọala ma gbapụta mmadụ 76 ndị omekome tọọrọ.

    Edward Buba kwuru na ndịagha nwetara ọtụtụ ngwa agha n’aka ndị omekome ahụ ha nwụchiri.

  13. Mmadụ asatọ anwụọla n’ihe mberede ugbọelu helikọpta ahụ mere na Port Harcourt

    Ụgbọelu helikọpta

    Ebe foto si, Getty Images

    Mịnịstrị na-ahụ maka njem ụgbọelu na Naịjirịa emeela ka a mata na mmadụ asatọ anwụọla n’ihe mberede ugboelu helikọpta ahụ mere na Port Harcourt, Rivas Steeti ụbọchị Tọzde, 24 Ọktoba, 2024.

    Ha mere ka amata nke a n’akwụkwọ ozi ha ziputara nke onyeisi ngalaba mgbasa ozi ha bụ Odutayo Oluseyi deputara.

    Dịka akwụkwọ ozi ahụ siri kwuo, ihe mberede ahụ mere na-ebe elekere 11:22 nke ụtụtụ oge ụgbọelu helikọpta ahụ sị ọdụ ndịagha dị na Port Harcourt na-aga NUIMANTAN bụ ebe a na-amị mmanụ agbidi.

    Mkpamkpa ahụ kpara na Bonny Finima dị na oke oshimiri Atlantic.

    Akwụkwọ ozi ahụ kọwara na ụgbọelu ahụ bụ Sikorsky SK76 nwere akara 5NBQG, bụ nke ụlọọrụ East Wind Aviation.

    Mịnịsta na-ahụ maka njem ụgbọelu bụ Festus Kayamo gara n’ihu zigara ezinaụlọ ndị mkpamkpa ahụ metutara ozi ịtị aka n’obi.

  14. Okonjo iweala, Simon Ekpa: Ihe ị kwesiri ịma maka akụkọ ego mbite IMF na-ewu ewu na soshal midia

    Foto Ngozi Okonjo-Iweala na Simon Ekpa

    Ebe foto si, Ngozi Okonjo-Iweala/Simon Ekpa/X

    Nkọwa foto, Foto Ngozi Okonjo-Iweala na Simon Ekpa

    Soshal midịa na-ada gharaghara gbasara ego a sịrị na ụlọakụ mba ụwa birila ndị na-achọ nwere onwe Biafra.

    Akụkọ ahụ na-efehari na ịntaneti kwuru “na ụlọọrụ IMF nyere gọọmentị Biafra ego mbite ruru $57.5billion maka ịma ọkwa nwere onwe ha chọrọ ime n’abalị abụọ nke ọnwa Dịsemba 2024 ma kelee Ngozi Okonjo-Iweala maka ya.

    Mana akụkọ ahụ ka Ngozi Okonjo Iweala onye bụ onyeisi ụlọọrụ World Trade Organization kọwara dịka okwu ụgha. O wepụtara nke a n'akara soshal mịdịa ya ma dụọ ndị na-ekesa okwu ụgha ahụ ka ha kwụsị ya ma kwuo na ndị niile chọrọ ịkpụ aha ya n'ala, wepụ aka n'atụmatụ ahụ.

    N’aka nke ọzọ, Simon Ekpa bụ onye e ji aha akara X ekesa ozi ahụ, kọwara ihe na-eme dịka ọrụ aka ndị chọrọ imebi aha ya.

    O kwuru na nke a abụghị oge mbụ ndị mmadụ na-eji aha ekesa okwu ụgha.

  15. Ụtụtụ ọma nu ụmụ Igbo

  16. Onyeisiala Tinubu agwala ụlọomeiwu Sineti ka ha kwado minista ọhụrụ ọ họpụtara

    Onyeisiala Bola Tinubu na Onyeisi ụlọomeiwu Sineti Godswill Akpabio

    Ebe foto si, Bola Tinubu/Nigeria Senate/Facebook

    Nkọwa foto, Onyeisiala Bola Tinubu na Onyeisi ụlọomeiwu Sineti Godswill Akpabio

    Onyeisiala Bola Tinubu edegarala ụlọomeiwu Sineti akwụkwọ ka ha kwado nhọpụta minista asaa ọ họpụtara ụbọchị Wenezde.

    Onyeisi ụlọomeiwu Sineti bụ Godswill Akpabio gụpụtara akwụkwọ ozi onyeisiala n’ọgbakọ ụlọomeiwu ahụ ụbọchị Tọzde.

    Akpabio gara n’ihu nyefee aha ndị ahụ onyeisiala họpụtara n’aka kọmitii ọ bụ ọrụ iji rụọ ọrụ na ya.

    Ndị aha ha dị n’akwụkwọozi ahụ gụnyere Bianca Ojukwu - Minista nta na-ahụ maka mmekọ mba ofesi, Jumoke Oduwole – Minista na-ahụ maka ụlọ mmepụta na azụmahịa, Nentawe Yilwatda – Minista na-ahụ maka ndị ụwa na-atụ n’ọnụ na igbochi ụbịam, Muhammadu Maigari Dingyadi – Minista na-ahụ maka ndị ọrụ na inwe ọrụ, Suwaiba Said Ahmad – Minista nta na-ahụ maka agụmakwụkwọ, Idi Mukhtar Maiha – Minista na-ahụ maka mmepụta anụmanụ na Yusuf Abdullahi Ata – Minista na-ahụ maka mmwụlite ụlọ na mmepe obodo.

  17. Ndị uweojii anwuchiela Uwakwe Eze na otu dibịa maka ọnwụ Chikwado Celestine Eze

    Uwakwe Eze na dibịa ahụ ndị uweojii nwuchiri

    Ebe foto si, Nigeria Police Enugu

    Nkọwa foto, Uwakwe Eze na dibịa ahụ ndị uweojii nwuchiri

    Ndị uweojii Enugwu steeti anwuchiela otu dibịa aha ya bụ Enuwa Odugu na Uwakwe Eze maka ọnwụ nwa ya nwoke bụ Chikwado Celestine Eze.

    Akụkọ anyị nwetara n’aka ndị uweojii kwuru na Uwakwe Eze duuru nwa ya bụ Chikwado Eze gaa n’ụlọ dibịa ahụ maka ọgwụ nchekwa. Dibia ahụ liri nwaamadị ahụ na ndụ iji mepụta ọgwụ ahụ mana nwaamadị ahụ nwụrụ tupu dibịa ahụ abọpụta ozu ya n’ala.

    Ka a nwuchiri dibia ahụ, ọ gwara ndị uweojii na ihe mere Chikwado jiri nwụọ n’emume imepụta ọgwụ ahụ bụ maka na orubeghi isi n’iwu o nyere ya.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Daniel Ndukwe kwuru n kọmishọna ndị uweojii steeti ahụ enyela iwu ka e mee nnyocha ma chọpụta ihe niile banyere ọnwụ Chikwado Celestine Eze.

    Ọ gara n’ihu kwuo na ngwangwa e mesịrị nnyocha, a ga-akpụpụ ha ụlọikpe.

  18. Ka chi fuo nu!

    Anyị ga-ahụ echi. Ka ọ dị nu.

  19. CAN agwala gọọmenti Abia steeti kwụsị atụmatụ ịna ndị ụka ụtụịsị maka 'signpost'

    Otu jikọrọ ndị ụka Kraịst bụ Christian Association of Nigeria (CAN) agwala Gọọmenti Abịa steeti ka ha kwụsị atụmatụ ịna ndị ụka ụtụisị maka signpost dịgasị ebe dị icheiche na steeti ahụ. CAN mere ka a mata nke a n’akwụkwọ ozi onyeisioche ha n’Abịa steeti bụ Ojo Ojo Uduma nakwa ode akwụkwọ ha bụ Francis Okere binyere aka.

    N’akwụkwọ ozi ahụ, CAN kwuru na ha na-arịọ Gọọmenti Abịa steeti ka ha “tulee atụmatụ ahụ nke ọma ma kwụsị ya ugbua ka ha hara ịhụ ha dịka ndị na-agba ụmụ Kraịst mgba”.“Ozọ bụ na gọọmenti nwekwara ike ịkpọ ndị isi ụka oku ka ha nọrọ ala tụlee atụmatụ ahụ”.Ha kwuru sị n'agbanyeghị na “ihe ahụ bụ obere ihe, ọ dị oke mkpa”.Ha gara n’ihu kelee Gọọmenti Abịa steeti ma kwee nkwa na ha ga na-ekpere ha ekpere.

  20. Izrel atụọla ogbunigwe na mpagahara Tyre dị na Lebanon

    Ọtụtụ ndị mmadụ agbaala ọsọ na mpaghara Tyre

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Ọtụtụ ndị mmadụ agbaala ọsọ na mpaghara Tyre

    Mba Izrel atụọla ogbunigwe anọ na mpaghara obodo Tyre dị na Lebanon n’ime awa ole na ole a malitere a iwepụ ndị bi na mpaghara ahụ.

    Ihe vidio gosịrị nnukwu anwụrụ ọkụ si na mpaghara ahụ dị nso n’ụlọọrụ uruuru Unesco World Heritage. Ka ọ dị ugbua, e nweghi onye ma mmadụ ole ogbunigwe ahụ metụtara.

    Ndịagha Izrel dọrọ aka na nti na ha ga-awakpo ebe ahụ ma gwa ndị bi ebe ahụ ka ha pụọ.

    ọtụtụ puku mmadụ esila obodo ahụ pụọ n’ime izuụka ole na ole dịka mwakpo Izrel n’akawanyenjọ na mpaghara ahụ.

    Tupu mwakpo ahụ a malite, onye na-ekwuru ndị ọrụ gbata gbata kwuru na mmadụ 14,000 ka bi na mpaghara ahụ, ha gụnyere ndị gbara maka mwakpo e mere na mpaghara Saụt Lebanon

    A tụrụ ogbunigwe ahụ na mpaghara ahụ dị nso ebe uruuru Roman ruins

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, A tụrụ ogbunigwe ahụ na mpaghara ahụ dị nso ebe uruuru Roman ruins