SSANU na NASU ga-amalite abụbụọrụ n’ụbọchị Tuzde

Otu jikọtara ndị nkụzi mahadum ọkwa ha dị elu bụ Senior Staff Association of Nigerian Universities (SSANU) na otu jikọtara ndị ọrụ abụghị ndị nkụzi n’ụlọakwụkwọ dị elu na Naịjirịa bụ Non Academic Staff Union of Educational and Associated Institutions (NASU) ekwupụtala abụbụọrụ amaghị mgbe ọ ga-akwụsị na mahadum etiti niile dị na Naịjirịa.
Otu onye ndu otu SSANU na mahadum Federal University of Technology Owerri bụ Maazị Franklin Duru kwuru na abụbụọrụ ahụ ga-amalite n’ụbọchị Tuzde 29 Ọktoba 2024.
Dịka Franklin Duru siri kwuo “ọ ga-abụ ịkwụsị ọrụ kpamkpam na mahadum niile dị na Naịjirịa site n’ụlọorụ Onyeisi mahadum bụ Vice Chancellor ruo n’ụlọorụ onye Registrar, ụlọorụ na-ahụ maka ọdịmma ụmụakwụkwọ nakwa ebe niile.”
Ọ sịrị na ndị ndu SSANU na NASU na Naịjirịa nyere ha ntụziaka ka ha hazie nzukọ na mahadum ha dị iche iche n’ụbọchị Mọnde 28 Ọktoba 2024 iji gwa ndị otu ha gbasara abụbụọrụ ahụ ma hụkwa na onye ọbụla rubere isi.
Cheta na n’ime ọnwa Maachị afọ a ka ndị otu SSANU na NASU gbara abụbụọrụ ịdọ aka na ntị abalị asaa iji kpọọ oku ka gọọmenti lebara ọnọdụ ha anya.



















