EBSU: Ihe kpatara ngagharịiwe na Mahadum Ebonyi State University
Ụmụakwụkwọ na Mahadu Ebonyi steeti mere ngagharịiwe n'ihi ụdị ule ọhụrụ ndị isi ụlọakwụkwọ ahụ tinyeere ha.
Ụdị ule a bụ nke a kpọrọ 'Computer Based test' maọbụ CBT n'aha ịchafụ.
Mana ụmụakwụkwọ na-ekwu na ha karịrị puku isii mana igwe kọmputa erughi otu narị maka ya bụ ule.
Ha kwukwara na Mahadum ha adịghị njikere chaachaa maka ịmalite ule ọhụrụ a.
Nke a mere ha ji malite ngagharịiwe.
- Ihe mere Ebonyi state ji bụrụ "elelịa nwa ite"
- 'Umahi na-akpụ ụkwụ n'ala na nzọụkwụ Sam Egwu n'agumakwụkwọ'
- 'Ihe ga-akwụsị ọgụ Agila(Benue) na Ngbo(Ebonyi) bụ itinye oke-ala'- Onyeisi Ohaukwu LGA
- Ndi Ugwu asaala Gọv Umahi okwu maka ebubo iwakpo ụmụnwaanyị Ebonyi
- 'A gwara m ha agala akwamozu ahụ' - Nwoke ihe mberede Ebonyi tara isi nwunye ya abụọ
Otu onyonyo mechara fesawa na otu nwata akwụkwọ nwụrụ oge a na-eme ngagharịiwe ahụ.
Mana ndị Mahadum EBSU nakwa ndị uweojii kwuru na nke ahụ bụ asịrị.
Ha gosiri ihe onyonyo nke gosiri na nwata ahụ anwụghị anwụ n'eziokwu.
Gere akụkọ a n'uju n'ihe onyonyo dị n'elu.