EBSU: Ihe kpatara ngagharịiwe na Mahadum Ebonyi State University

Aha onyonyo, Ngagharịiwe ụmụakwụkwọ EBSU

Ụmụakwụkwọ na Mahadu Ebonyi steeti mere ngagharịiwe n'ihi ụdị ule ọhụrụ ndị isi ụlọakwụkwọ ahụ tinyeere ha.

Ụdị ule a bụ nke a kpọrọ 'Computer Based test' maọbụ CBT n'aha ịchafụ.

Mana ụmụakwụkwọ na-ekwu na ha karịrị puku isii mana igwe kọmputa erughi otu narị maka ya bụ ule.

Ha kwukwara na Mahadum ha adịghị njikere chaachaa maka ịmalite ule ọhụrụ a.

Nke a mere ha ji malite ngagharịiwe.

Otu onyonyo mechara fesawa na otu nwata akwụkwọ nwụrụ oge a na-eme ngagharịiwe ahụ.

Mana ndị Mahadum EBSU nakwa ndị uweojii kwuru na nke ahụ bụ asịrị.

Ha gosiri ihe onyonyo nke gosiri na nwata ahụ anwụghị anwụ n'eziokwu.

Gere akụkọ a n'uju n'ihe onyonyo dị n'elu.