NYSC scheme in Nigeria: Etu m siri si ụzọ ife ala nna nyere aka rụọ okporoụzọ n'obodo ezigara m
Otu nwoke ka gụchara akwụkwọ na mahadum gara obodo e zigara ya bụ obodo Ayegbami dị na Kwara steeti, tinye aka rụpụtara obodo ahụ okporoụzọ nke bụ otu n'ime ihe kacha enye obodo ahụ nsogbu.
Mgbe Obinna Gabriel Andrew bịara obodo ahụ, o kpebiri na ọ ga-arụrụ ndị obodo ahụ otu ọrụ ọma.
Ọ kwuru na ọ jụrụ otutu ndị obodo ahụ ihe kacha echekasị ha.
Ha gwara ya na nsogbu ha ka nkụ mana nke kachasị bụ nsogbu ụzọ ha nke gụnyere otu ụzọ jịkọrọ mpaghara asaa n'obodo ahụ.
O kwukwara na ụzọ ahụ adighị mma ma ncha maka na mbuze mebichara ya bụ ụzọ.
Gabriel si na ụzọ mgbasaozi pụrụiche mee ka onye nnọchiteanya obodo ahụ nụrụ olu ya ma bịa mezie ya bụ ụzọ.
Ugbua ndị obodo ahụ nọ n'aṅụrị maka ihe o tinyere aka mepụtara ha n'agbanyeghi ihe ndị chere ya aka mgba mgbe ọ malitere ya bụ ọrụ.
Kirie ihe onyonyo a ka ị nụrụ etu Gabriel si mee ihe ịtụnanya a.
