NYSC Uniform: Ihe mere m ji chịnye nwa m uwe NYSC m yiri afọ 37 gara aga

Aha onyonyo, Ihe mere m ji chịnye nwa m uwe NYSC m yiri afọ 37 gara aga

Joseph Chukwu wuru ewu nso nso a ka ọ chinyere nwa ya uwe o ji mee NYSC n'afọ 37 gara aga.

Ọ gwara BBC Igbo ihe mere o ji chịnye nwa ya nwaanyị uwe ahụ, ma kwuo na ọ dị mkpa ilekọta ihe e tinyere mmadụ n'aka.

O kwuru sị "Ọ bụrụ na anyị bụ ndị Naịjiria na-elekọta ihe e nyere anyị n'aka ka ọ ghara imebi, Naịjiria ga na-aga n'ihu."

Chukwu kwukwara na e kwesịghị ka a kpachapụ ife ala nna anyị.

Gee ihe o kwuru n'uju: