Coronavirus: 'Anyị ga-eji 'Mobile App' ahụ na ụmụakwụkwọ mere ihe omume enyere ha'
Iwu mmechi gọọmentị nyere ka ụloakwụkwọ mechie biara na mberede nye ndị ụlọakwụkwọ maka ọrịa coronavirus.
Mkparịtaụka BBC na onye isi ụloakwụkwọ 'First Nuture' bụ Chidinma Nwoke na nke 'Great Lawra Wood School Queens Hall' bụ Ngozi Ikoro gosiri ihe ha na-eme ka ha ọmụmụ ụmụakwụkwọ ha na-aga n'ihu.
Ha kọwara na na-agbanyeghị na mmechi a bịara na mberede, ha ga-eji ihe dịka Whatsapp na mobile App akụzịrị ụmụakwụkwọ ihe dịka ha nọ n’ezumike.
Ha rịokwara nne na nna ka ha nyere aka ị hụ na ụmụ ha mere ihe omume e nyere ha n’ụlo akwụkwọ n’oge ezumike a.