Mmadụ abụọ anwụọla dịka ndị oji egbe wakporo ụlọọrụ ndị uweojii n'Ebonyi steeti

Ndị uweojii gbagburu otu n'ime ndị omekome wakporo ụlọọrụ ha dị n'Ugbuodo, n'okpuruọchịchị Ebonyi dị n'Ebonyi steeti.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. A nwụchiela nwa dị afọ 21 gwuru ndị mmadụ wayo N2bn

    Nwata nwoke dị afọ 21

    Ebe foto si, Special Fraud Unit,Lagos

    Aka ndị uweojii ọrụ ha bụ ilebanye anya n'ihe gbasara iji aghụghọ napụ ndị mmadụ ego akparala otu nwata nwokorobịa gbara afọ 21 maka igwu ndị mmadụ chamdum ego ruru ijeri Naira abụọ(N2bn.)

    Nwa amadị ahụ aha ya bụ Dominic Ngene Joshua bu onye MD/CEO of Brisk Capital Limited, bụ onye Ebonyi steeti ma biri n'Uyo isi obodo Akwa-Ibom ebe ọ nọ aka ike.

    Joshua bụ onye anwụchiri dịka ọtụtụ ndị o gwuru chamdum degara ndị uweojii akwụkwọ mkpesa na-esi na soshal midia; Instagram, Facebook na Linkedin nakwa akwụkwọ akụkọ alara ndị mmadụ dịjkka ọ na-aghara ha ụgha na ya bụ onye oji ego achụ ego na-enyere ndị mmadụ aka itinye ego ha n'ihe ga-amụtara ha ego.

  2. Ugwu na-agbọpụta ọkụ enyela ndi mmadụ ọsọ na mba DRC

    Mount Nyiragongo DR Congo

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndị mmadụ nọ n’ọsọ na mba Democratic Republic of Congo dịka ugwu Nyiragongo bidoro ịgbọpụta ọkụ kamgbe abalị satụde .

    Gọọmentị mba ahụ ekwubeghị etu ọnodụ ebe ahụ dị ugbu a kama ha sị na ya bụ ọkụ na-ebelata.

  3. Ihe mere n'izuụka gara aga agaghị emezị ọzọ n'imo steeti - Hope Uzodinma

    Hope Uzodinma

    Ebe foto si, Hope Uzodinma/ Facebook

    Gọvanọ Imo steeti bụ Hope Uzodinma agwala ndị Imo steeti na kepukep na-ekwu na ndị omekome chọro ịwakpo ụlọọru goọmewntị na steeti ahụ bụ ezigbo asị.

    Ọ bụ mgbe ana-aka ụka pụrụ iche maka n'ụka dị n'Obi gọọmentị Imo steeti ka o kwuru nke a ma sị na ihe mere n'izuụka gara aga agaghịzi eme ọzo na steeti ahụ.

    Uzodinma kwuru sị, " Anyị ga-ememila onye ọbụla chọro iweta ọgbaaghara n'Imo steeti, Gọọmentị enweghi ike ịọnye ndi omekome na ndị na-ebute ọgbaaghara na steeti ohere".

  4. Gere akụkọ dị mkpa n'abalị taa n'otu nkeji

  5. Ihe ruru mmadụ 3000 ebutela ọrịa 'black fungus' n'India

    Onye ọrịa black fungus ji

    Ebe foto si, AFP

    Ihe ruru mmadụ puku itoolu ebutela ọrịa a kpọrọ 'Black fungus' na mba India dịka ọrịa ahụ na-arị elu na mba ahụ.

    Nje na-ebute ya a na-akpọ mucormycosis, nwere pasentị iri ise igbu mmadụ, ebe e nwereike ịzọpụta ndị ọzọ site n'ịwepụ otu anya ha.

    A chọpụtara na ọrịa a na-emetụtakwa ndị na-arịa maọbụ sirila n'ute ọrịa Covid-19 gbakee.

    Ndị dọkịta na-ekwu na ọ dị ka o nwere etu o si si na 'steroid' a na-eji agwọ ndị na-arịa covid-19. Ndị nwere ọrịa shuga kacha nọrọ na nsogbu ibute ya.

    Ndị dọkịta gwara BBC na ọ dị ka mmadụ a na-ebute ya ihe dị ka ụbọchị 12 ruo 18 o si n'ọrịa covid-19 gbakechaa.

  6. Jiri naanị otu nkeji gere akụkọ ga-amasị gị ịkọ taa niile

  7. Mgbawa ugwu na-agbọpụta ọkụ achụpụla ọtụtụ mmadụ na DR Congo

    Ndị obodo Goma dị na Dr Congo

    Ebe foto si, EPA

    Gọọmentị mba DR Congo ewepụtala atụmatụ iji kpọpụta ndị mmadụ n'obodo Goma dịka mgbawa ugwu na-agbọpụta ọkụ mere ụnyaahụ.

    Ugwu Nyiragongo gbawara n'abalị n'obodo Goma bụ ebe ihe ruru nde mmadụ abụọ bi.

    Puku kwuru puku mmadụ ejirila ụkwụ na-eri mbo mbo ọsọ na-agbaga oke ala ndị dị ha nso nke gụnyere Rwanda, dịka agwọ banyere n'akịrịka.

    Mba Rwanda kwuru na ihe ruru mmadụ puku atọ ejirila ụkwụ gafeta mba ha, dịka ha na-ekwu na ha ga-enye ha ụlọakwụkwọ na ụlọekpere ebe ha ga-anọ.

    Mgbawa ugwu a ji kilomita iri nọrọ nso obodo Goma, gbawara ikpeazụ n'afọ 2002, mgbe o gburu mmadụ narị abụọ na iri ise ma chụpụ mmadụ otu puku narị na iri abụọ n'ụlọ.

    Ngalaba Monusco bụ ndị ụlọọrụ United Nations (UN) so ahụ na udo dị na mba ahụ, ziputara ihe onyonyo gosiri mgbọpụta ọkụ ahụ.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  8. Mmadụ abụọ anwụọla dịka ndị oji egbe wakporo ụlọọrụ ndị uweojii n'Ebonyi steeti

    Ụlọọrụ ndị uweojii ndị omekome wakporo

    Ebe foto si, Ebonyi state police

    Nkọwa foto, Mgbọ egbe wụkasịrị ahụ aja ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Ugbuodo

    Ndị uweojii gbagburu otu n'ime ndị omekome wakporo ụlọọrụ ha dị n'Ugbuodo, n'okpuruọchịchị Ebonyi dị n'Ebonyi steeti.

    Mgbọ tụrụ nwaamadi a mgbe ndị uweojii na ndị omekome a ruru iri abụọ nọ na-akwakọrịta mgbọ.

    Dịka Loveth Odah bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ si kwuo, a hụrụ otu egbe AK-47, ekwentị na mma n'aka onye omekome ahụ nwụrụ anwụ, ebe ndị ọzọ riri mbombo ọsọ dịka mgbọ egbe merụrụ ụfọdụ n'ime ha ahụ.

    Odah kwukwara na otu onye uweojii nwụkwara na ya bụ mwakpo.

    Kọmishọna uweojii nke Ebonyi steeti bụ Aliyu Garba enyela iwu ka a maa imi n'ala chọpụta ndị omekome a.

    O mere nke a ka ọ garuru n'ụlọọrụ ebe ihe mere iji were anya ya hụ ihe mere.

  9. Naanị mmadụ 35 ka a chọtara covid-19 n'ahụ ha ọhụrụ na Naịjiria

    Ngalaba NCDC chọtara mmadụ iri atọ na ise ọhụrụ bu ọrịa covid-19 na Naịjiria.

    Ụfọdụ n'ime ha gụnyere mmadụ anọ butere ya na Rivas steeti, itoolu na Legọs, nakwa atọ si Akwa Ibom steeti.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  10. Nnọọ

    Anyị na-anabata gị n'ụtụtu.

    Ka ụbọchị taa maara gị mma oo. Iseee.

  11. Atletico Madrid eburula iko Spanish La Liga nke afọ 2021

    Atletico Madrid

    Ebe foto si, Atletico de Madrid/Twitter

    Otu egwuregwu Atletico Madrid eturula ugo n'asọmpi La Liga nke Spen site n'ịmabute iko asọmpi a nke 2020/2021.

    Ha mere nke a site n'iji ọkpụ goolu abụọ asatara otu merie Real Valladolid n'asọmpi ikpeazụ a gbara n'ụbọchị Satọde.

    Goolu abụọ a nyere Atletico mmeri si n'aka Angel Correa na nkeji 57' nakwa Luiz Suarez na nkeji 67'.

    Nke a ga-abụ mbụ Atletico na-amabute iko La Liga kamgbe afọ asaa gara aga ma bụrụ nke ugboro iri na otu ha kamgbe asọmpi a malitere.

    Ha ji akara iri asatọ na na isii bụrụ ndị mbụ na tebụlụ, Real Madrid na-eso ha ji akara iri asatọ na anọ, Barcelona ji iri asaa na itoolu bụrụ ndị atọ ebe Sevilla ji akara iri asaa na anọ bụrụ ndị anọ.

  12. BBC Nkeji nke abalị

  13. Ebe Ọchịagha Attahiru Ibrahim rụrụ ọrụ tupu ọ nwụọ

    Attahiru Ibrahim

    Ebe foto si, Nigerian Army

    Ọchịagha Attahiru Ibrahim ka werela ọchịchị dịka onyeisi ndịagha Naịjiria n'ọnwa Jenụwarị 2021 na mmadụ iri si Abuja na-aga njem ọrụ na Kaduna n'ụbọchị Mee 21 mgbe ụgbọelu ha kpọkasịrị na Kaduna n'ihi 'ajọ ọnọdụ ihu igwe' dịka ndị agha si kwuo.

    Ọchịagha rụrụ ọrụ dịka onyeisi (General Commanding Officer) na ngalaba 82 division nke ndị agha dị n'Enugwu steeti site n'afọ 2015 ruo 2016 tupu e ziga ya ka ọ bụrụ onyeisi ndị na-ebuso Boko Haram agha n'afọ 2017.

    Ọ rụrụ ọrụ dịka onyeisi ndịagha na-ebuso ndị Boko Haram agha na Borno steeti, nke a kpọrọ 'Operation Lafiya Dole'.

    Ọ bụ oge Attahiru na-achịkọta ngalaba a ka Boko Haram kpara ọtụtụ mkpamkpa ha kpara n'afọ 2017.

    N'ọnwa Disemba afọ 2017, e wepụrụ Attahiru dịka onyeisi 'Operation Lafiya Dole' ma zighachi ya n'isi ụlọọrụ ndị agha dị n'Abuja.

    Ọ nọchiri Ọchịagha Tukur Buratai n'ọnwa Jenụwarị 2021.

    Ọ bụ Ọchịagha Naịjiria nke iri abụọ na ise tupu ihe mberede a edulaa ya mmụọ.

  14. Iheanacho nyere 'goolu kacha mma na 'season' a' na Leicester City

    Kelechi Iheanacho natara ihe nrite 'goolu kacha mma na sizin a' n'aka otu egwuregwu ya bụ Leicester City.

    Ihe nrite a bụ maka ọmarịcha goolu o nyere mgbe ha na Crystal alace zutere na Premier League.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

  15. Nnọọ

    I meela wee bịakwute anyị taa.

    Nọnyere anyị ka anyị wetara gị akụkọ ndị ga-amasị gị.

    Ndeewo.

  16. Ihe gọomentị kwuru maka mbuli ọnụego mmanụ ụgbọala

    Ọdọ mmanụ ụgbọala

    Ebe foto si, Getty Images

    Gọọmentị etiti ekwela ndị Naịjirịa nkwa na ha agaghị ebuli ego ọnụ mmadụ ụgbọala n'ọnwa Juun afọ 2021.

    Osote minista na-ahụ maka mmanụ agbịdị bụ Timipre Sylva kwere nkwa n'ozi o wepụtara n'Abuja n'ụbọchị Fraịde.

    Ọ sị na mkpebi gọọmentị mere egosighi etu ihe si kwụrụ ugbua n'ahịa mmadụ agbịdị mana uche ha dị na mkparịtaụka ha na ndị ọrụ.

    "Ọnụ ego mmadụ ụgbọala ga-adị etu ọ dịị ugbua n'ọnwa Juun ruo mgbe gọọmentị na ndị ọrụ ga-enwecha mkparịtaụka".

    Sylva kọwara na ọ dị mkpa ime ka nke a doo ndị mmadụ anya dịka otu jikọtara ndị gọvanọ mere mkpebi ibuli ọnụego mmadụ ụgbọala.

    Ọ dọrọ ndị na-ere mmanụ ụgbọala aka na ntị ka ha emela ihe ọbụla ga-ebute ụkọ mmanụ ụgbọala na Naịjirịa.

    Ọ rịọkwara ndị mmadụ ka ha dere jụụ ghara ịtụ ụjọ n'ịzụ mmanụ ụgbọala.

    "Ụlọọrụ Nigerian National Petroleum Corporation (NNPC) nwere mmanụ ga-ezuru Naịjirịa niile ruo oge dị anya."

    Otu kọmitii ndị gọvanọ hiwere nọọrọ n'ụbọchị Wenesde nyere atụmatụ sị ka e bulie ọnụego mmanụ ụgbọala n'ọnụego dị N408.5 kwa otu lita maọbụ N380 kwa otu lita.

  17. Onye ọbụna ga-edebanye akara IMEI nke ekwentị ya n'ime ọnwa atọ - NCC

    Ekwentị

    Ebe foto si, Getty Images

    Ngalaba 'Nigeria Communication Commission' enyela iwu ka onye ọbụla nwere ekwentị na Naịjirịa debanye akara a kpọrọ 'International Mobile Equipment Identity' nke ekwentị ya.

    NCC kwuru nke a n'ime akwụkwọ iwu ngalabụ ahụ edegharịrị ọhụrụ gbasara ndebanye akara ekwentị na Naịjirịa, bụ nke a kpọrọ 'Revised National Identity Policy for SIM Card Registration'.

    N'ime akwụkwọ iwu a, NCC kwuru na onyeisiala Muhammadu Buhari kwadoro ya bụ atụmatụ, ma kwukwaa na ha wepụtara ọnwa atọ ka ndị mmadụ debanye akara a.

    Dịka NCC si kwuo, atụmatụ a ga-amalite n'ọnwa Julaị afọ 2021.

    NCC kọwara na ha wepụtara atụmatụ ndebanye IMEI a iji:

    • Gbochie ekwentị adịgboroja ịbata Naịjirịa
    • Belata oke ozuzu a na-ezu ekwentị ndị mmadụ
    • Bawanye nchekwa na Naịjirịa
    • Chekwaa ụmụ Naịjirịa nwere ekwentị
    • Belata ntọrị mmadụ
    • Kwụsị ndị ekperima iji ekwentị akpa arụ
    • Mee ka ọ dị mfe ịchọta ekwentị na-efu efu... dgz

    Gịnị bụ IMEI

    IMEI
    Nkọwa foto, Lee ihe bụ akara IMEI

    IMEI bụ akara dị iri na ise n'ọnụọgụgụ nke ekwentị ọbụla na-ebu abịa.

    Onweghị ekwentị abụọ nwere tu ụdị IMEI.

    Ọ bụ akara njirimara ekwentị ọbụla, nke e nwere ike chọta ya bụ ekwentị ebe ọbụla ọ dị, n'agbanyeghị 'sim card' dị n'ime ya.

    Etu i ga-esi nweta IMEI nke gị bụ site n'ịpị *#06#.

    Naanị ndị ọrụ nchekwa nakwa ndị Tekịnụzụ ma etu IMEI si arụ ọrụ nke ọma, ọ bụghịkwanụ ihe ha ga-agba n'anwụ ka ndị ekperima ghara ịmata ya

  18. Israel na Palestine ekwetela ịkwụsị ịlụ ọgụ

    Ọgụ Israel na Palestine

    Ebe foto si, Getty Images

    Mba Izrel na Palestine ekwekọrịtala ịkwụsị ịkwakọrịta onwe ha mgbọ nke malitere kamgbe abalị iri na otu gara aga.

    Ya bụ nkwekọrịta, a kpọrọ 'ceasefire' na bekee, malitere n'ụbọchị Fraịde a.

    Ndị mmadụ malitere ịkpagharị na mpaghara Gaza ngwangwa ya bụ nkwekọrịta malitere, mana ndị otu Hamas kwuru na ha ka kekwara nkwụcha maka adịghị ama ama.

    Onyeisiala Amerịka bụ Joe Biden kwuru na nke a bụ akụkọ ọma, nke ga-enye ohere maka ọganihu.

    N'ụbọchị Tọzde, Izrel gbara ihe karịrị ogbunigwe otu narị na mpaghara ugwu nke Gaza, ebe Hamas zaghachiri site n'ịgbakwa ọtụtụ ogbunigwe nke ha na Izrel.

    Ihe karịrị mmadụ narị abụọ na iri anọ atụnyela isi ha na ya bụ ọgụ, imirikiti n’ime ha bụ ụmụnwaanyị na ụmụ aka.

    Akụkọ kwukwara na ọ bụ na mpaghara Gaza ka ndị mmadụ kacha nwụọ, mana mba abụọ ekwetaghị na e nwere onye meriri ibe ya.

  19. Kwụsịnụ mbuli ọnụ ego ọkụ latrik - Ụlọ Omeiwu nta

    Ọkụ latrik

    Ebe foto si, PA Media

    Ndị Ụụlọ omeiwu nta bụ 'House of Assembly' na bekee agwala gọọmentị etiti ka akwụsịgodu atụmatụ ibuli ọnụ ego ọkụ latrik.

    Ha kwuru nke a n'ọgbakọ ha n'Abuja n'ụbọchị Tọzde, ma kọwaa na ihe isi ike dị na Naịjirịa ugbua karịrị akarị.

    Gọọmentị etiti kwuburu na a ga-ewelikwu ọnụ ego ọkụ latrik malite n'ọnwa Jun afọ 2021.

    Mana ndị omeiwu na-ekwu na nke a adabaghị adaba.

    Aniekan Umanah

    Ebe foto si, Aniekan Umanah/Twitter

    Nkọwa foto, Aniekan Umanah, onye omeiwu si Akwa Ibom steeti, bụ ya welitere okwu a n'ụlọ omeiwu.

    Aniekan Umanah, onye welitere ya bụ okwu n'ọgbakọ ndị omeiwu, kwuru na gọọmentị ebuliela ọnụ ego latrik ugboro ise kamgbe afọ 2015, nke ikpeazụ e buliri ya bụ n'ọnwa Jenụwarị afọ 2021.

    Umanah kwara arịrị na gọọmentị dịka ha amaghị ihe ụmụ mmadụ na-agabiga ugbua, ọ kachasị dịka ọrịa coronavirus tikpọrọ akụnụba ọtụtụ mmadụ.

    O kwukwara na ụlọọrụ ọkụ latrik na-amịgbu ụmụ Naịjirịa amịgbu n'ihi oke ego ha na-ana maka ọkụ, mana ya bụ ọkụ anaghị adị kwadaa.

  20. Ụnụ asaala chi

    Igbo ndị ọma, ụnụ abọọla chi.

    Taa bụ ahịa Nkwọ.

    Ka Nkwọ kwọtara onye ukwu na onye nta ihe ọma o.