A nwụchiela nwa dị afọ 21 gwuru ndị mmadụ wayo N2bn

Ebe foto si, Special Fraud Unit,Lagos
Aka ndị uweojii ọrụ ha bụ ilebanye anya n'ihe gbasara iji aghụghọ napụ ndị mmadụ ego akparala otu nwata nwokorobịa gbara afọ 21 maka igwu ndị mmadụ chamdum ego ruru ijeri Naira abụọ(N2bn.)
Nwa amadị ahụ aha ya bụ Dominic Ngene Joshua bu onye MD/CEO of Brisk Capital Limited, bụ onye Ebonyi steeti ma biri n'Uyo isi obodo Akwa-Ibom ebe ọ nọ aka ike.
Joshua bụ onye anwụchiri dịka ọtụtụ ndị o gwuru chamdum degara ndị uweojii akwụkwọ mkpesa na-esi na soshal midia; Instagram, Facebook na Linkedin nakwa akwụkwọ akụkọ alara ndị mmadụ dịjkka ọ na-aghara ha ụgha na ya bụ onye oji ego achụ ego na-enyere ndị mmadụ aka itinye ego ha n'ihe ga-amụtara ha ego.













