Ọrịa ọhụrụ ejituola ehi nọ n'Abia steeti

Aha onyonyo, Ọrịa ọhụrụ ejituola ehi nọ n'Abia steeti

Kọmishọna na-ahụ maka ọrụ ugbo n'Abia bụ Ikechi Mgboji adọọla ndị Abia aka na ntị ha ghara iri anụ ngụgụ ehi ọbụla nọ na steeti ahụ ugbua.

O kwuru na ọ bụ ka ha ghara ibute ọrịa ọ kpọrọ "Bovine Tuberclosis" nke a chọpụtara na steeti ahụ ọhụrụ a.