Igbo Cuisine: Ji a hụrụ ahụ, nri ụtọ na-eme ka a tabie aka
Ọbụghị sọ sọ mmadu ka Igbo nwere. Igbo nwekwere nri ndị mmadụ a na-eri!
Ọ bụ onye amaghị maka Igbo na-agbagha okwu a.
Makana, ebe ọbụla ịgara n'ala Igbo ịga ahụrịrị nri eji eche nri, nke eji ezuike nakwa nke eji ataghari ọnụ.
Nke a pụtara na-agbanyeghị nri nke bụ nrị, enwere nke eji enye ya ume.
Ji ahụrụ ahụ sobu n'ime nri eji ejide afọ tupu erie nke bụ nri kpọọkpọọ, mana agba ọhụru emela ya nke ọpụrụiche.
Na mgbe ochie, ọ bụ ihe eji akasi arịkwọ obi ma a gaa ọrụ.
Nke a bụ makana isi ya dị mfe - nwere ji tinye n'ọkụ, kpacha ya ma ya yio, tinye ose na mmanụ, ticha aka banye oriri.
Ihe nkiri gosiri usoro esi ahazi ya nke ọma nakwa ụfọdụ ihe eji agwa ya.

