Ọgba Mbọ: Ọtụtụ ndị enyi m gbara m ọsọ maka na m na-ebu ozu - Adaeze Okosi

Aha onyonyo, Ọtụtụ ndị enyi m gbara m ọsọ maka na m na-ebu ndị ozu

Adaeze Okosi bụ otu n'ime ndị ntoroọbịa gụchara mahadum na Naijirịa ma ha enwewghị ọrụ.

Kama Adeze onye gụrụ 'Anatomy' na Mahadum malitere tinyewe ihe ọ gụrụ na mahadum n'ọrụ; o bidoro ịnya ụgbọala eji ebu ozu.

Abia na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naijirịa, ịnya ụgbọala eji ebu ozu nke bụ Hearse n'okwu bekee bụ ọrụ a na-ahụ dịka ọrụ ụmu nwoke.

Kama nke a egbochighị Adaeze ịbanye ya bụ ọrụ ma na-eme ya nke ọma.

Adaeze kwuru na ọtụtụ ndị enyi ya gbaara ya ọsọ kamgbe o bidoro ịnya ụgbọala eji ebu ozu.

O kwukwara na nne na nna ya kwadoro ya kama na ụfọdụ ndị mmadụ anaghị ekwe enye ya ọrụ maka na ọ bụ nwaanyị.

Ụfọdụ na-ekwu na oge ụfọdụ ndị mmụọ na-enye ndị na-anya ụgbọala e ji ebu ozu nsogbu, mana Adaeze kwuru na ụdị ihe ahụ emetụbeghị ya.

"Enwebeghị mgbe ụdịrị ahụmihe dị otu a kamgbe m malitere ọrụ a," Adaeze kwuru.

"Ana m arụ ọrụ m, gaa ụka, ma bidokwa ọrụ m ọzọ. Anaghị m ahụ ihe ọbụla dịka ndị mmụọ maọbụ ihe gbara gharị".

Adaeze kwuru na ya malitere ọrụ a na mbido afọ 2022 ma kwukwaa na ọ na-enyere ya aka.

Ọ bụ Chigozie Ohaka na Chiemela Mgbeahuru mere akụkọ a