Jude Ogene nwetara n'aka Onyeisiala Buhari ihe nrite maka mbọ ọ gbara n'oge NYSC ya
Onye ọrụ nwere ụgwọ, dịka Igbo kwuru.
Jude Ogene fere ala nna ya, nke a kpọrọ 'National Youth Service Corps' n'afọ 2017.
N'oge ahụ, ọ rụrụ ụlọ mposi n'ụlọ ndị nche ụlaakwụkwọ ebe ọ nọ fee ala nna na Yobe steeti.
Afọ atọ ọ mechere ya, aha ya pụtara dịka onye nke ise ga-eso rita nturuugo site n'aka gọọmentị etiti maka mbọ ahụ ọ gbara.
Gọọmentị kwere nkwa inye ya ọrụ nakwa ịkwụrụ ya ụgwọ akwụkwọ rụọ n'ogogo Ph.D.
Jude Ogene gwara BBC Igbo na ihe kacha wute ya bụ na nna ya anọghịzị ndụ rie uru mkpụrụ ọma ọ kụrụ.